Psalms 131

Abụ nrigo, nke Devid.

Abụ nke ndị dị nwayọọ nʼobi

1O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m,
ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;
adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m
maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;
dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,
e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.

3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị a
ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.
Copyright information for IboBIU